Nahum 1

1Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.

Iwe Onyenwe anyị megide Ninive

2 Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ.
Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi.
Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya,
oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,
Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.
Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,
igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,
o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.
Bashan na Kamel na-akpọnwụ,
otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,
ugwu nta niile na-agbazekwa,
elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,
ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.

7 Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu
gbuo ndị iro ya
Ọ bụ Ninive ka a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe
niile,
ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.

9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị
ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe;
nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu,
ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu,
ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
11Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta,
bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị,
na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
12Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga.
Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ,
ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu,
tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”

14 Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive:
“Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.
Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi,
bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile.
Aga m akwadokwa ili gị,
nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”

15Lee, nʼelu ugwu niile
ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị,
bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị!
Mee mmemme gị niile gị Juda,
mezukwaa nkwa niile i kwere.
Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha,
nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
Copyright information for IboBIU